У нас вы можете посмотреть бесплатно Igbo Folktale 1 - Tortoise marries a princess или скачать в максимальном доступном качестве, видео которое было загружено на ютуб. Для загрузки выберите вариант из формы ниже:
Если кнопки скачивания не
загрузились
НАЖМИТЕ ЗДЕСЬ или обновите страницу
Если возникают проблемы со скачиванием видео, пожалуйста напишите в поддержку по адресу внизу
страницы.
Спасибо за использование сервиса ClipSaver.ru
In this story, tortoise deceives elephant and marries the princess. Akụkọ mbe na enyi TRANSCRIPT N’oge gboo. N’ala Iduu na Ọba. Onwere otu eze mụrụ nnwa nwaanyị. Aha nnwa nwaanyị ahụ bụ Adaeze. Adaeze mara ezigbo mma. Oge Adaeze toruru ịlụ di, ọ sị na naanị onye kpụtaara ya enyi ka ya ga-alụ. Ka ọ ga-abụ enwee emume enwere n’obodo ha, ya rịgoro n’elu enyi ahụ na-agagharị, ọha na eze amara na n’ezie ya bụ ada eze. Ụmụ okorobịa dị iche iche bịara ịlụ Adaeze, mana Adaeze alụghị onye ọ bụla n’ime ha. Onye elu bịara ịlụ Adaeze, Adaeze jụrụ. Onye ala bịara ịlụ Adaeze, Adaeze sị mba, na ya agaghị alụ. Onye ukwu bịara ịlụ Adaeze, Adaeze sị mba, ya agaghị alụ ya. Onye nta bịakwara ịlụ Adaeze, Adaeze sị ya mba, na ya agaghị alụ, maka na ọ kpụtaghị enyi. O wee ruo otu ụbọchị mbe wee na-agafe wee nụ ka ndị mmadụ na-akọ maka Adaeze. Ha sị na Adaeze sị na naanị onye kpụtaara ya enyi ka ya ga-alụ. Mbe wee gaa na nke eze. Oge o rutere na nke eze, ọ sị eze na ha biko kwadowekwa, na ya ga-abịa echi ịlụ Adaeze. Mbe na enyi bụ enyi. Mbe wee gaa na nke enyi, wee sị enyi, na eze ga-agba ọfala echi, na eze sị ya zie enyi, na ọ bụ enyi ga-abụ onye isi oche ọfala ahụ. Obi tọrọ enyi ụtọ nke ukwuu. Obi ụtọ ekweghi ya rahụọ ụra n’abalị ahụ. Ka ọnwa na-eti zaa, enyi jere gaa n’elu, o jere gaa n’ala. Obi ana-atọ ya. N’isi ụtụtụ, enyi tetara, wee gaa na nke mbe, sị mbe biko ya kwado ọsịsọ, ka ha gawa na nke eze. N’ihi na ọ bụ yanwa bụ enyi ga-abụ onye isi oche. Na ya chọrọ irute ebe ahụ n’oge. Ha wee kwado gawa. Ka ha na-aga, enyi na-agasi ike, wee sị mbe biko ya gasiwe ike. Ka ha wee rute ebe ahụ n’oge. Mbe sị ya na ọ kwa ọ ma na ụkwụ yanwa bụ mbe etoghị ogologo dị ka nke enyi. O wee rịọ enyi sị enyi biko ka enyi kwọrọ ya n’azụ. Enyi ekweta. Wee hulọta. Mbe mere ka ọ magoro n’azụ enyi, mana ọ magonwuu, maka na ụkwụ yanwa bụ mbe, etoghị ogologo. O wee rịọ enyi ka o were ụdọ a o ji n’aka kedotụ enyi n’olu ka o wee kwere ya mmagoro. Enyi kweere, o wee kedo enyi ụdọ n’olu wee magoro. Ha wee na-aga. Ka ha na-eru nso n’ụlọ eze. Mbe wee welie olu sị: Nna m eze akpụta m enyi Nna m eze akpụta m enyi Enyi asị ya: Nwa mbe, ị sị na ị kpụta onye Nwa mbe, ị sị na ị kpụta onye Mbe azaa ya sị: Asị m ala ya dube enyi chebe enyi Ọ dị ka asị m na akpụta m enyi Asị m ala ya dube enyi chebe enyi Ọ dị ka asị m na akpụta m enyi Ọ kwa enyi ga-abụ isi oche Ọ kwa enyi ga-abụ isi oche Enyi na-aga na anyị so gị n’azụ Enyi na-aga na anyị so gị n’azụ Ka ha na-erute na nke eze, mbe were ụdọ ahụ o kedoro enyi n’olu wee nye eze, sị ya, lekwa enyi m kpụtara iji lụọ Adaeze. Otu ahụ ka mbe jiri were enyi wee lụọ Adaeze Website: www.igbovillagesquare.com